7 Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.
8 Gi olile-anya Israel, onye-nzọputa-ya na mb͕e ahuhu, n'ìhi gini ka I di ka ọbìa n'ala nka, na dika onye-ije nke setiworo ulo-ikwū-ya inọ ọnọdu-abali?
9 N'ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n'etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.
10 Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.
11 Jehova we sim, Ekpela ekpere bayere ndi nka ichọ ọdi-nma-ha.
12 M'gbe ha nēbu ọnu, M'gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n'ajọ oria na-efe efe ka M'gaje iji me ka ha gwusia.
13 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M'gēnye unu n'ebe a.