9 N'ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n'etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.
10 Otú a ka Jehova siri ndi nka, Ọbuná otú a ka ha huworo nwaghari n'anya; ha eb͕ochighi ukwu-ha: ihe-ha atọghi kwa Jehova utọ; ub͕u a ka Ọ nēcheta ajọ omume-ha, were nmehie-ha leta ha.
11 Jehova we sim, Ekpela ekpere bayere ndi nka ichọ ọdi-nma-ha.
12 M'gbe ha nēbu ọnu, M'gaghi-nānu iti-nkpu-ha; ọzọ, mb͕e ha nēsure àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma, ihe-ha agaghi-nātọm utọ: kama mma-agha na oké unwu n'ajọ oria na-efe efe ka M'gaje iji me ka ha gwusia.
13 M'we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, ndi-amuma nāsi ha, Unu agaghi-ahu mma-agha, unu agaghi-enwe kwa oké unwu; kama udo nke ezi-okwu ka M'gēnye unu n'ebe a.
14 Jehova we sim, Amuma ugha ka ndi-amuma nēbu n'aham: eziteghm ha, enyekwaghm ha iwu, agwakwaghm ha okwu: amuma ọhù ugha, na nke iju arusi ase, na nke ihe-efu, na nke aghughọ nke obi-ha, ka ha nēburu unu.
15 N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n'aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n'ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia.