6 Okwu Jehova we rue Jeremaia, bú onye-amuma, nti, si,
7 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi eze Juda, onye zìworo unu biakutem ijum ase; Le, usu-ndi-agha Fero, nke putaworo iyere unu aka, gālaghachi n'ala-ya, bú Ijipt.
8 Ndi Kaldea gābiaghachi kwa, buso obodo a agha; ha gēwere kwa ya, sure ya n'ọku.
9 Otú a ka Jehova siri: Unu arafula nkpuru-obi-unu, si, Ndi Kaldea aghaghi isi n'imegide ayi la: n'ihi na ha agaghi-ala.
10 N'ihi na ọ buru na unu etib͕usia usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea ndi nēbuso unu agha, nání ndi adupúru adupú ewe fọdu n'etiti ha, ma ha gēbili, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, we sure obodo a n'ọku.
11 O rue, mb͕e usu-ndi-agha nke ndi Kaldea siri n'imegide Jerusalem rigo n'ihi usu-ndi-agha Fero,
12 na Jeremaia siri na Jerusalem pua ije ala Benjamin, iketa òkè-ya n'ebe ahu, n'etiti ndi Israel.