9 Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we ṅuara ha iyi, ṅu-kwa-ra ndikom-ha, si, Unu atula egwu ifè ndi Kaldea: birinu n'ala, fè kwa eze Babilon, ọ gādi-kwa-ra unu nma.
10 Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo.
11 Ọzọ kwa, ndi-Ju nile ndi nọ na Moab, na n'etiti umu Amon, na n'Edom, na ndi nọ n'ala nile, nuru na eze Babilon enyewo Juda ndi fọduru, na o mewo kwa Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, onye-nlekọta-ha;
12 ndi-Ju nile we si n'ebe nile achugara ha-ri lata, we bata n'ala Juda, biakute Gedalaia, rue Mizpa, we chikọta manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru nke-uku.
13 Ọzọ, Johanan nwa Karea, na ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha ndi nọ n'ọhia, biakutere Gedalaia rue Mizpa,
14 si ya, Ì mara n'ezie na Bealis, bú eze umu Amon, ezitewo Ishmael nwa Netanaia itib͕u gi onwe-gi? Ma Gedalaia nwa Ahaikam ekweghi ihe ha kwuru.
15 Johanan nwa Karea we gwa Gedalaia okwu na nzuzo nime Mizpa, si, Biko, ka m'je, m'gētib͕u kwa Ishmael nwa Netanaia, ma ọ dighi onye ọ bula gāma: n'ihi gini ka o gētib͕u gi onwe-gi, Juda nile ewe b͕asa, bú ndi achikọtaworo n'ebe i nọ, ndi Juda fọduru ewe la n'iyì?