10 Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.
11 Rigorue Gilead, nara balm, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Ijipt: n'efu ka i meworo ka ọgwu ba uba; ọ dighi ọgwu-ntechi i nwere.
12 Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n'ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n'otù ka ha dakọworo, ha abua.
13 Okwu ahu nke Jehova gwara Jeremaia, bú onye-amuma, bayere ọbibia nke Nebukadreza, bú eze Babilon, itib͕u ala Ijipt.
14 Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.
15 Gini mere eji zachapu onye nke gi di ebube? o guzoghi, n'ihi na Jehova kwaturu ya.
16 O mere ka ndi nāsu ngọngọ di ọtutu, e, otù onye dakwasiri ibe-ya: ha we si, Bilie, ka ayi laghachikuru ndi-ayi, laghachi kwa n'ala amuru ayi, pua n'iru mma-agha nēme ihe-ike.