25 Le, Mu nēmegide gi, gi ugwu nēbibi ebibi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), nke nēbibi uwa nile: M'gēseti kwa akam imegide gi, kpọreda gi site na nkume-gi nile di elu, mee ka i ghọ ugwu esurere esure.
26 Ha agaghi-eweputa nime gi otù nkume ido na nkuku-ulo, ma-ọbu otù nkume itọ ntọ-ala; n'ihi na ebe nke tọb͕ọrọ n'efu mb͕e ebighi-ebi ka i gābu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
27 Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.
28 Donu mba di iche iche nsọ imegide ya, donu ndi-eze Midia, na ndi nāchi ala-ya, na ndi-ya nile nọchiri anya eze, na ala nile ọ nāchi, nsọ.
29 Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.
30 Ndi-dike Babilon arapuwo ibu agha, ha nọduru n'ebe nile ha ewusiri ike; idi-ike-ha alasiwo; ha aghọwo ndinyom: ndi-iro-ha esuyewo ọku n'ebe-obibi-ya nile; etijiwo ihe-ntuchi-ya nile.
31 Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya: