48 Elu-igwe na uwa na ihe nile nke di nime ha ewe tie nkpu ọṅù bayere Babilon; n'ihi na ndi nāpunara ya ihe gēsi n'Ugwu biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
49 Ọbuná Babilon aghaghi ida, unu ndi eb͕uru eb͕u nke Israel, ọ bu kwa na Babilon ka ndi ala ahu nile eb͕uru eb͕u gāda.
50 Unu ndi b͕apuworo na mma-agha, jenu, unu eguzola; chetanu Jehova site n'ebe di anya, ka Jerusalem bata kwa n'obi-unu.
51 Ihere emewo ayi, n'ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n'iru: n'ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova.
52 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēji nmehie-ha leta arusi-ya nile apiri api; ọ bu kwa n'ala-ya nile ka ndi emeruworo aru gāsu udè.
53 Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
54 Ge nti olu iti-nkpu sitere na Babilon, na olu ntipia uku sitere n'ala ndi Kaldea!