27 I gāgwa kwa ha okwu ndia nile; ma ha agaghi-ege gi nti: i gākpọ kwa ha òkù; ma ha agaghi-aza gi.
28 I gāsi kwa ha, Nka bu mba ahu nke nēgeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, nke nānaraghi kwa idọ-aka-na-nti: ikwesi-ntukwasi-obi alawo n'iyì, ebipuwo kwa ya n'ọnu-ha.
29 Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.
30 N'ihi na umu Juda emewo ihe jọrọ njọ n'anyam; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ha edowo ihe-árú nile ha n'ulo ahu nke akpọkwasiri aham, imeru ya.
31 Ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Tofet, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, isure umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'ọku; bú ihe nke M'nēnyeghi n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim.
32 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ya Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u: ha gēlì kwa ozu na Tofet n'ihi na ebe ilì ozu adighi.
33 Ozu ndi nka gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri; ọ dighi kwa onye nāruli ha.