23 Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:
24 kama, onye nānya isi, ya nya isi na nka, na o nwere uche n'ebe M'nọ, we maram, na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ebere na ikpé ziri ezi na ezi omume n'uwa: n'ihi na ihe ndia atọwom utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
25 Le, ubọchi nābia, (ọbu ihe si N'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gewere nmehie-ha leta ndi nile bìri úgwù n'ebìghi-úgwù-ha;
26 bú Ijipt, na Juda, na Edom, na umu Amon, na Moab, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha, ndi bi n'ọzara: n'ihi na mba nile bu ndi anēbighi úgwù, ulo Israel nile bu kwa ndi anēbighi úgwù n'obi.