5 Ndi-ub͕ọ we tua egwu, we tikue, onye ọ bula chi-ya; ha we tufue ihe nile nke di n'ub͕ọ n'oké osimiri, ime ka ọ di kari nfe n'aru ha. Ma Jona ridarari n'ime-ime-ala ub͕ọ; o we dina ala, da n'oké ura.
6 Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n'iyì.
7 Ha we sirita ibe-ha n'otù n'otù, Bianu, ka ayi fe nzà, ka ayi we mara n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru. Ha we fe nzà nzà we ma Jona.
8 Ha we si ya, Biko, gosi ayi n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru; òle ozi i nēje? ọ̀ bu kwa ole ebe i si bia? òle ala-gi? òle ndi i siri nime ha puta?
9 O we si ha, Onye-Hibru ka m'bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m'nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ.
10 Ndikom ahu we tua oké egwu, si ya, Gini bu ihe a i meworo? N'ihi na ndikom ahu mara na ọ bu n'iru Jehova ka ọ nēsi b͕alaga, n'ihi na o gosiri ha-ri.
11 Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu.