8 Ha we si ya, Biko, gosi ayi n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru; òle ozi i nēje? ọ̀ bu kwa ole ebe i si bia? òle ala-gi? òle ndi i siri nime ha puta?
9 O we si ha, Onye-Hibru ka m'bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m'nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ.
10 Ndikom ahu we tua oké egwu, si ya, Gini bu ihe a i meworo? N'ihi na ndikom ahu mara na ọ bu n'iru Jehova ka ọ nēsi b͕alaga, n'ihi na o gosiri ha-ri.
11 Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu.
12 O we si ha, Bulienum, tubàm n'oké osimiri; oké osimiri ewe dajua ghara imakwasi unu: n'ihi na mu onwem amawo na ọ bu n'ihim ka oké ifufe di uku a nēfekwasi unu.
13 Ma ndikom ahu we nyasie ike inyaghachi ub͕ọ n'ala; ma ha apugh: n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu megide ha.
14 Ha we kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, biko, ekwela ka ayi la n'iyì n'ihi ndu nwoke a, etiyekwasi-kwa-la n'isi ayi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: n'ihi na Gi onwe-gi, bú Jehova, emewo dika o si tọ Gi.