1 O rue, mb͕e Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, nuru na Joshua ewerewo Ai, wezuga kwa ya ka ebibie ya; dika ọ mereri Jeriko na eze-ya, otú a ka o mere Ai na eze-ya; mb͕e ọ nu-kwa-ra na ndi bi na Gibeon emewo ka ha na Israel di n'udo, ha we nọ n'etiti ha;
2 o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n'ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n'ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike.
3 Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si,
4 Rigokutenum, yerem aka, ka ayi tib͕u kwa Gibeon: n'ihi na ọ mere ka ya onwe-ya na Joshua na umu Israel di n'udo.