8 Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.
9 Joshua we me ha dika Jehova siri ya: o bipuru nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha, sure kwa ub͕ọ-ala nile ha n'ọku.
10 Joshua we laghachi na mb͕e ahu, were Hezoa, were mma-agha tib͕ue eze-ya: n'ihi na Hezoa na mb͕e gara aga bu isi ala-eze ahu nile.
11 Ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu nile nke di nime ya, ha wezugara ha ka ebibie ha: ọ dighi onye nēku ume fọduru: o sure Hezoa n'ọku.
12 Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu.
13 Nání, obodo nile nke Jehova nke nēguzo n'obo-ha, Israel esureghi ha ọku, nāgughi Hezoa nání ya; nke ahu ka Joshua surere ọku.
14 Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n'agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu.