19 Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.
20 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.
21 Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n'akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua;
22 na Kina, na Dimona, na Adada;
23 na Kedesh, na Hezoa, na Itnan;
24 na Zif, na Telem, na Bealot;
25 na Hezoa-hadata, na Keriot-hezron (nke ahu bu Hezoa);