20 Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n'akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di.
21 Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz;
22 na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el;
23 na Avim, na Para, na Ọfra;
24 na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:
25 na Gibeon, na Rema, na Beirot;
26 na Mizpeh, na Kefira, na Moza;