21 Joshua na Israel nile-hukwara na ndi nēru nbì ewerewo obodo ahu, hu kwa na anwuru-ọku obodo arigowo n'elu, ha we laghachi, tib͕ue ndikom Ai.
22 Ndi nēru nbì si kwa n'obodo puta izute ha; ha we nọ n'etiti Israel, ndi si n'ọzara nọ n'otù akuku, ndi si n'obodo nọ kwa n'akuku ọzọ: ha we tib͕ue ha rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ma-ọbu onye b͕apuru ab͕apu arapuru ha.
23 Ha we were eze Ai na ndu, me ka ọ biarue Joshua nso.
24 O rue, mb͕e Israel b͕usiri ndi nile bi na Ai n'ọhia, bú n'ọzara ebe ha churu ha, mb͕e ha nile dasiri n'ọnu mma-agha, rue mb͕e ha gwusiri, na Israel nile laghachiri na Ai, ọnu mma-agha tib͕ue ya.
25 Ndi nile ndi dara n'ubọchi ahu, ma nwoke ma nwayi, we di orú nnù madu na nnù iri, bú ndikom nile nke Ai.
26 Ma Joshua eseghachighi aka-ya, nke o ji zo nkpunkpu ube ahu, rue mb͕e o wezugasiri ndi nile bi na Ai ka ebibie ha.
27 Nání na Israel lutara n'onwe-ha anu-ulo na ihe-nkwata nke obodo ahu n'agha, dika okwu Jehova si di nke O nyere Joshua n'iwu.