26 Ma Joshua eseghachighi aka-ya, nke o ji zo nkpunkpu ube ahu, rue mb͕e o wezugasiri ndi nile bi na Ai ka ebibie ha.
27 Nání na Israel lutara n'onwe-ha anu-ulo na ihe-nkwata nke obodo ahu n'agha, dika okwu Jehova si di nke O nyere Joshua n'iwu.
28 Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta.
29 Ọ we kwuba eze Ai n'osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi weda ozu-ya, tuda ya n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta.
30 Mb͕e ahu Joshua wuru ebe-ichu-àjà nye Jehova, bú Chineke Israel, n'ugwu Ibal,
31 dika Moses, bú orù Jehova, nyere umu Israel iwu, dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, bú ebe-ichu-àjà nkume zuru okè, nke ọ nēmeghi ka ígwè ga n'elu ha: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, chu kwa àjà-udo.
32 O we dekwasi na nkume ahu n'ebe ahu ndeputa iwu Moses, nke o dere n'akwukwọ n'iru umu Israel.