4 Ma ha gēbi, onye ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya; ọ dighi kwa onye gēme ka ha ma jijiji: n'ihi na ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ekwuwo okwu.
5 N'ihi na ndi nile di iche iche nējeghari, onye ọ bula n'aha nke chi-ya; ayi onwe-ayi ganējeghari kwa n'aha Jehova, bú Chineke-ayi, rue mb͕e nile ebighi-ebi.
6 N'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ka M'gēme ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi zukọta, ọ bu kwa nwanyi ahu nke achupuru achupu ka M'gāchikọta, ya na nwanyi nke M'meworo ihe ọjọ;
7 M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi ghọ ndi fọduru afọdu, M'gēme kwa ka nwanyi ahu nke emere ka ọ nọ n'ebe di anya ghọ mba nwere ume: Jehova gābu kwa eze-ha n'ugwu Zaion site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
8 Ma gi onwe-gi, ulo-elu nke ìgwè aturu, Ofel nke ada Zaion, gi ka ọ gābiakute; e, ọchichi anāchi mbu gābia, bú ala-eze nke diri ada Jerusalem.
9 Ub͕u a n'ihi gini ka i nētisi nkpu ike? Ọ̀ bu na eze adighi na gi? onye-ndum-ọdu-gi, ọ lawo n'iyì, na ihe-nb͕ali ejidewo gi dika nke nwanyi ime nēme?
10 Nāb͕ali, Jisie ike imuputa nwa, gi ada Zaion, dika nwanyi ime nēme: n'ihi na ub͕u a ka i gāpu n'obodo, biri n'ọhia, biarue Babilon; n'ebe ahu ka agānaputa gi; n'ebe ahu ka Jehova gāb͕aputa gi n'aka ndi-iro-gi.