5 Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova.
6 M'gēji gini bia n'iru Jehova, rube isi n'iru Chineke di elu? #m'gābia n'iru Ya chiri ihe àjà-nsure-ọku, chiri umu-ehi b͕ara otù arọ?
7 Ọ̀ gātọ Jehova utọ, bú nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbu orú nnù kwuru orú nnù iyi manu? #m'gēnye ọkparam n'ihi njehiem, nkpuru afọm n'ihi nmehie nkpuru-obim?
8 Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?
9 Olu Jehova nākpọ obodo òkù, onye-nzube-ihe gāhu kwa aha-Gi: nurunu nkpa-n'aka, na Onye kaworo ya.
10 Ọ̀ di àkù nmebi-iwu fọduru n'ulo onye-nmebi-iwu, ma-ọbu ephah nērughi eru nke nākpasu Chineke oké iwe?
11 M'gādi ọcha n'obi mb͕e m'nwere ihe-ọtùtù nmebi-iwu, mb͕e m'nwe-kwa-ra akpa nkume-ọtùtù aghughọ?