6 M'gēji gini bia n'iru Jehova, rube isi n'iru Chineke di elu? #m'gābia n'iru Ya chiri ihe àjà-nsure-ọku, chiri umu-ehi b͕ara otù arọ?
7 Ọ̀ gātọ Jehova utọ, bú nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbu orú nnù kwuru orú nnù iyi manu? #m'gēnye ọkparam n'ihi njehiem, nkpuru afọm n'ihi nmehie nkpuru-obim?
8 Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?
9 Olu Jehova nākpọ obodo òkù, onye-nzube-ihe gāhu kwa aha-Gi: nurunu nkpa-n'aka, na Onye kaworo ya.
10 Ọ̀ di àkù nmebi-iwu fọduru n'ulo onye-nmebi-iwu, ma-ọbu ephah nērughi eru nke nākpasu Chineke oké iwe?
11 M'gādi ọcha n'obi mb͕e m'nwere ihe-ọtùtù nmebi-iwu, mb͕e m'nwe-kwa-ra akpa nkume-ọtùtù aghughọ?
12 N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha.