15 Dika n'ubọchi i siri n'ala Ijipt puta, otú a ka M'gēme ka ọ hu oké ọlu di iche iche.
16 Mba di iche iche gāhu ya, ihere idi-ike-ha ewe me ha: ha gātukwasi aka n'ọnu, nti-ha gēchi.
17 Ha gāracha ájá dika agwọ; dika ihe di iche iche nke nākpu akpu nke ala, otú a ka ha gēwere ima-jijiji si n'ebe-nmechibido nile ha puta: Jehova, bú Chineke-ayi, ka ha gābiakute n'oké egwu, ha gātu kwa egwu gi.
18 Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.
19 Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.
20 I gēnye Jekob ezi-okwu, me-kwa-ra Abraham ebere, bú nke I ṅuworo nna-ayi-hà n'iyi site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie.