1 O rue, mb͕e ọnwu Joshua gasiri, na umu Israel juru Jehova ase, si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi imegide ndi Kenean, ibuso ha agha?
2 Jehova we si, Juda gārigo: le, enyewom ala nka n'aka-ya.
3 Juda we si Simeon, bú nwa-nne-ya, Sorom rigo n'ala-ife-nzàm, ka ayi we buso ndi Kenean agha; mu onwem gēsoro kwa gi je n'ala-ife-nzà-gi. Simeon we soro ya je.
4 Juda we rigo; Jehova we nye ndi Kenean na ndi-Perizait n'aka-ha: ha we tib͕ue ha nime Bezek, orú nnù ndikom na nnù ise.
5 Ha we hu Adoni-bezek nime Bezek: ha we buso ya agha, tib͕ue ndi Kenean na ndi-Perizait.
6 Ma Adoni-bezek b͕alagara; ha we chua ya n'azu, jide ya, bipu isi-aka-ya abua na isi-ukwu-ya abua.
7 Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.