8 Umu Juda we buso Jerusalem agha, were ya, were ọnu nma-agha tib͕ue ya, su obodo ahu ọku.
9 Emesia umu Juda ridara ibuso ndi Kenean agha, bú ndi bi n'ugwu, na nime Negeb, na n'ebe di ala ala.
10 Juda we jekuru ndi Kenean ndi bi na Hebron: (ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba:) na tib͕ue Sheshai, na Ahiman, na Talmai.
11 O si n'ebe ahu jekuru ndi bi na Debia. (Ma aha Debia na mb͕e ara aga bu Kiriat-sefa.)
12 Keleb we si, Onye ahu nke gētib͕u Kiriat-sefa, were ya, m'gēnye kwa ya Aksa, bú nwam nwayi, na nwunye.
13 Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne ntà Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.
14 O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa we si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?