9 Umu Amon we gabiga Jọdan ibuso kwa Juda, na ibuso Benjamin, na ibuso ulo Efraim, agha; ewe kpab͕ue Israel nke-uku.
10 Umu Israel we tikue Jehova, si, Ayi emehiewo megide Gi, ọbuná n'ihi na ayi arapuwo Chineke-ayi, we fè Bealim òfùfè.
11 Jehova we si umu Israel, Àzọputaghm unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi-Amorait, na n'aka umu Amon, na n'aka ndi Filistia?
12 Ndi Zaidon kwa, na Amalek, na Maon, meb͕uru unu; unu we tikuem, M'we zọputa unu n'aka-ha.
13 Ma unu onwe-unu arapuwom, we fè chi ọzọ di iche iche òfùfè: n'ihi ya M'gaghi-azọputa kwa unu ọzọ.
14 Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.
15 Umu Israel we si Jehova, Ayi emehiewo: Gi onwe-gi me ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-Gi; biko, nání naputa ayi ta.