2 Nwunye Gilead we muara ya umu-ndikom; nwunye-ya we tolite, chupu Jefta, si ya, I gaghi-eketa ihe n'ulo nna-ayi; n'ihi na nwa nwayi ọzọ ka i bu.
3 Jefta we b͕apu n'iru umu-nne-ya, biri n'ala Tob: ndikom efu we chikọta onwe-ha n'ebe Jefta nọ, ha we soro ya pua.
4 O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na umu Amon busoro Israel agha.
5 O rue, mb͕e umu Amon busoro Israel agha, na ndi-okenye Gilead jere ikuputa Jefta n'ala Tob:
6 ha we si Jefta, Bia, buru ayi onye-ọchi-agha, ka ayi we buso umu Amon agha.
7 Jefta we si ndi-okenye Gilead, Ùnu onwe-unu akpọghm asì, chupukwam n'ulo nnam? ma gini mere unu biakuteworom ub͕u a mb͕e unu nọ na nkpab͕u?
8 Ndi-okenye Gilead we si Jefta, N'ihi nka ka ayi biaghachikuteworo gi ub͕u a, ka i we soro ayi je, buso umu Amon agha, i gāghọ-kwa-ra ayi onye-isi, bú ndi nile bi na Gilead.