3 M'we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n'akam: n'ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha?
4 Jefta we chikọta ndikom nile nke Gilead, buso Efraim agha: ndikom Gilead we tib͕ue Efraim, n'ihi na ha siri, Ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim ka unu, bú ndi Gilead, bu, n'etiti Efraim, na n'etiti Manase.
5 Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è;
6 ha si ya, Biko, si Shibolet; ọ si, Sibolet; n'ihi na o dozighi onwe-ya ikpọ ya nke-ọma; ha we jide ya, b͕ue ya na ngabiga-miri Jọdan: orú nnù ndikom uzọ ise na nnù ise we da mb͕e ahu site n'Efraim.
7 Jefta we kpe Israel ikpe arọ isi. Jefta, bú onye Gilead, we nwua, elìe ya n'obodo Gilead.
8 Mb͕e ọ nwusiri, Ibzan, onye sitere na Bet-lehem, we kpe Israel ikpe.
9 O nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ọ muru, ọ bu kwa orú umu-ya ndinyom na iri ka o zipuru n'èzí, orú ndinyom na iri ka o me-kwa-ra ka ha si n'èzí batara umu-ya ndikom. O we kpe Israel ikpe arọ asa.