16 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, Ọ buru na i b͕ochiem, m'gaghi-eri nime nri-gi: ọ buru kwa na i me àjà-nsure-ọku, ọ bu Jehova ka i gēsurere ya. N'ihi na Manoa amaghi na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.
17 Manoa we si mọ-ozi nke Jehova, Gini bu aha-gi, ka ayi we sọpuru gi mb͕e okwu-gi nile gēre?
18 Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini kwa ka i nāju ajuju bayere aham, ebe aha ahu di ebube?
19 Manoa we were nwa-ewu ahu na onyinye-inata-iru-ọma, surere ya Jehova ọku n'elu oké nkume: mọ-ozi nālu kwa oké ọlu, ma Manoa na nwunye-ya nēle ya anya.
20 O rue, mb͕e ire-ọku nēsi n'ebe-ichu-àjà ahu rigo n'elu-igwe, na mọ-ozi nke Jehova rigoro nime ire-ọku nke ebe-ichu-àjà ahu: Manoa na nwunye-ya nēle kwa ya anya; ha we da kpue iru-ha n'ala.
21 Ma mọ-ozi ahu emeghi ka Manoa na nwunye-ya hu kwa ya anya ọzọ. Mb͕e ahu Manoa mara na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu.
22 Manoa we si nwunye-ya, Ayi aghaghi inwu, n'ihi na ọ bu Chineke ka ayi huworo.