8 Manoa we riọ Jehova aririọ, si, Biko, Onye-nwe-ayi, ka onye nke Chineke ahu nke I zitere biaghachikute ayi ọzọ, ariọm I, ka o zí kwa ayi ihe ayi gēme nwata ahu nke agāmu.
9 Chineke we ge nti olu Manoa; mọ-ozi nke Chineke we biakute nwayi ahu ọzọ ka ya onwe-ya nānọdu n'ubi: ma Manoa, bú di-ya, anọyeghi ya.
10 Nwayi ahu we me ngwa, b͕a ọsọ, gosi di-ya, si ya, Le, nwoke ahu nke biakuterem ubọchi a emewo ka m'hu ya anya ọzọ.
11 Manoa we bilie, jeso nwunye-ya, biakute nwoke ahu, si ya, Gi onwe-gi, ì bu nwoke ahu nke gwara nwayi a okwu? O we si, Mu ka ọ bu.
12 Manoa we si, Ub͕u a ka okwu-gi nile rè: gini gābu ikpé bayere nwata ahu, gini gābu kwa omume-ya?
13 Mọ-ozi nke Jehova we si Manoa, N'ihe nile nke m'siri nwayi a ya lezie anya.
14 Ọ gaghi-eri ihe sitere n'ihe ọ bula nke nēsi n'osisi vine nke manya-vine puta, ya aṅu-kwa-la manya-vine na ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, ya eri-kwa-la ihe ọ bula ruru árú; ihe nile nke m'nyere ya n'iwu ka ọ gēdebe.