12 Ha si ya, Ike gi ab͕u ka ayi ridataworo, inye gi n'aka ndi Filistia. Samson we si ha, Ṅuaranum iyi, ka unu we ghara idakwasim, unu onwe-unu.
13 Ha we gwa ya okwu, si, É-è; kama ayi gēkesi gi ab͕u ike, nye gi n'aka-ha: ma ayi agaghi-eme ka i nwua ma-ọli. Ha we chiri udọ̀ ọhu abua ke ya ab͕u, me ka o si na nkume ahu di elu rigota.
14 Mb͕e ya onwe-ya biaruru Lehi, ndi Filistia we tie nkpu n'izute ya: Mọ nke Jehova we dakwasi ya n'ike, udọ̀ abua nke di n'ogwe-aka-ya abua we di ka flax nke reworo n'ọku, ab͕u-ya nile we b͕azepu n'aka-ya abua.
15 O we huta ọkpukpu-àb͕à ọhu nke inyinya-ibu, setipu aka-ya, jide ya, were ya tib͕ue nnù ndikom abua na ọgu iri.
16 Samson we si,Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo, otù obo, obo abua,Ọkpukpu - àb͕à inyinya - ibu ka m'jiworo tib͕u nnù ndikom abua na ọgu iri.
17 O rue, mb͕e o kwubìri okwu, na ọ tupuru ọkpukpu-àb͕à-anu ahu n'aka-ya; o we kpọ ebe ahu Remat-lehi.
18 Akpiri we kpọ ya nku nke-uku, o we kpọkue Jehova, si, Gi onwe-gi esiwo n'aka orù-gi nye nzọputa uku a: ma ub͕u a m'gānwu n'akpiri-ikpọ-nku, dabà n'aka nke ndia anēbìghi úgwù.