1 Ma otù nwoke nke ugwu Efraim di, aha-ya bu Maika.
2 Ọ si nne-ya, Nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu i nwere nke ewere ewere, nke gi onwe-gi b͕ara iyi bayere ya, i we kwu kwa ya na ntim, le, ọla-ọcha ahu di n'akam; mu onwem were ya. Nne-ya we si, Onye agọziri agọzi diri Jehova ka nwam bu.
3 Ọ we nyeghachi nne-ya nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise ahu, nne-ya we si, Edoworom Jehova ọla-ọcha ahu nsọ n'ezie site n'akam inye nwam, ime arusi apiri api na arusi awuru awu: ma ub͕u a m'gēnyeghachi gi ya.
4 Ọ we nyeghachi nne-ya ọla-ọcha ahu, nne-ya we chiri ọgu ego ọla-ọcha iri, nye onye-nnucha-ọla, o we me ya arusi apiri api na arusi awuru awu: o we di n'ulo Maika.
5 Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.
6 Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya.
7 Otù nwa-okorọbia di kwa nke sitere na Bet-lehem-juda, site n'ab͕uru Juda, onye ahu bu onye Livai, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa n'ebe ahu.