15 Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, biarue ulo nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai, bú ulo Maika, jua ya ajuju bayere udo-ya.
16 Nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha-ha, bú ndi sitere n'umu Dan, nēguzo kwa n'oghere ọnu-uzọ-ama.
17 Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.
18 Ma mb͕e ndia bara n'ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme?
19 Ha we si ya, B͕a nkiti, kpuchie aka n'ọnu-gi, soro ayi je, ghọ-kwa-ra ayi nna na onye-nchu-àjà: òle nke ka nma, ka i buru onye-nchu-àjà diri ulo nke otù nwoke, ma-ọbu ka i buru onye-nchu-àjà diri otù ebo na otù ab͕uru n'Israel?
20 Obi onye-nchu-àjà ahu we di nma, o we chiri ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi apiri api ahu, ba n'etiti ndi ahu.
21 Ha we chigharia je, tiye umu-ntakiri-ha na unu-ulo-ha na àkù-ha n'iru ha.