5 Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.
6 Onye-nchu-àjà ahu we si ha, Jenu n'udo: na ncherita-iru Jehova ka uzọ-unu di, nke unu nēje ije nime ya.
7 Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.
8 Ha we biakute umu-nne-ha rue Zọra na Eshtaol: umu-nne-ha we si ha, Gini ka unu onwe-unu gēkwu?
9 Ha si, Bilie, ka ayi rigo kwa imegide ha: n'ihi na ayi ahuwo ala ahu, ma, le, ọ di nma nke-uku: ùnu onwe-unu nāb͕a kwa nkiti? unu adila ume-ngwu ije na ibà inweta ala ahu.
10 Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n'aka abua: n'ihi na Chineke enyewo ya n'aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n'uwa nakọ n'ebe ahu.
11 Nnù ndikom na ọgu iri ndi ekere ihe-agha, ndi sitere n'ab͕uru ndi Dan, we si n'ebe ahu, bú Zọra na Eshtaol, bulie ije.