18 Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m'si bia, m'we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n'ulo-ya.
19 Otú ọ di, ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo diri inyinya-ibu-ayi; ọzọ kwa, achicha na manya-vine dirim, di-kwara-ra orù-gi nwayi, di-kwara nwa-okorọbia nke nēso ndi-orù-gi: ọ dighi ihe ọ bula nākọ ayi.
20 Agadi nwoke ahu we si, Udo diri gi; nání, ihe nile nākọ gi dikwasim; nání, anọla ọnọdu-abali n'amá.
21 O we me ka ọ ba n'ulo-ya, gwara inyinya-ibu nri-ha: ha we sa ukwu-ha, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.
22 Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.
23 Nwoke ahu, bú onye-nwe ulo, we pukuru ha, si ha, É-è, umu-nnem, biko, unu emela ihe ọjọ; ebe nwoke a bataworo n'ulom, unu emela ihe-nzuzu a.
24 Le, nwam nwayi, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, na iko-ya nwayi; biko, ka m'me ka ha puta, weda-kwa-nu ha n'ala, me ha ihe di nma n'anya-unu: ma unu emela nwoke a ihe-nzuzu a.