8 O we bilie n'isi-ututu n'ubọchi nke-ise ila; nna nwa-ab͕ọghọ ahu we si, Biko, nwe ume n'obi-gi, o we b͕agwoju ha anya rue mb͕e ubọchi rudara; ha abua we rikọ ihe.
9 Nwoke ahu we bilie ila, ya onwe-ya, na iko-ya nwayi, na nwa-okorọbia-ya; ma ọgọ-ya, bú nna nwa-ab͕ọghọ ahu, siri ya, Biko, le, ike agwu ubọchi, o rubewo anyasi, biko, nọnu ọnọdu-abali: le, ubọchi erudawo, nọ ọnọdu-abali n'ebe a, ka o we diri obi-gi nma; ma bilienu n'isi-ututu echi ije ije-unu, ka i we la n'ulo-ikwū-gi.
10 Ma nwoke ahu ekweghi inọ ọnọdu-abali, kama o biliri la, o we biarue ncherita-iru Jebus (nke ahu bu Jerusalem): inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa nēso kwa ya, iko-ya nwayi nēso kwa ya.
11 Mb͕e ndi ahu nọ nso Jebus, ubọchi jemiri nke-uku; nwa-okorọbia ahu we si onye-nwe-ya, Biko, bia, ka ayi wezuga onwe-ayi jerue obodo a nke ndi Jebus, nọ ọnọdu-abali nime ya.
12 Onye-nwe-ya we si ya, Ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi jerue obodo onye ala ọzọ, ebe onye sitere n'umu Israel nānọghi; kama ayi gāgabiga rue Gibea.
13 O we si nwa-okorọbia-ya, Bia, ka ayi biarue nso otù nime ebe ndia; ayi gānọ kwa ọnọdu-abali na Gibea, ma-ọbu na Rema.
14 Ha we gabiga, nēje ije-ha; anyanwu we dakpugide ha n'akuku Gibea, nke diri Benjamin.