19 O rue, n'ọnwu onye-ikpe ahu, na ha laghachiri, we bibie onwe-ha kari ndi bu nna-ha, n'ijeso chi ọzọ ifè ha òfùfè, na ikpọ isi ala nye ha; ha ekweghi ka ihe si n'omume nile ha, ma-ọbu n'uzọ-ha siri ike, dapu.
20 Iwe Jehova we di ọku megide Israel; O we si, N'ihi na mba nka agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyeworo ndi bu nna-ha n'iwu, n'ihi na ha egeghi kwa nti olum;
21 Mu onwem agaghi-anapu kwa onye ọ bula ala-ya n'iru ha ọzọ site na mba nile ndi Joshua rapuru mb͕e ọ nwuru:
22 ka M'we were ha nwa Israel, ma ha nēdebe uzọ Jehova ije ije nime ya, dika ndi bu nna-ha debere ya, ma-ọbu na ha edebeghi ya.
23 Jehova we rapu mba ahu, ghara inapu ha ala-ha ngwa ngwa; O nyeghi kwa ha n'aka Joshua.