1 Ma ndikom Israel ṅuru iyi na Mizpa, si, Ọ dighi nwoke ọ bula nime ayi gēnye Benjamin nwa-ya nwayi na nwunye.
2 Ndi Israel we biarue Bet-el, nọdu n'ebe ahu rue anyasi n'iru Chineke, welie olu-ha, kwa ákwá nke-uku.
3 Ha we si, Jehova, bú Chineke nke Israel, n'ìhi gini ka nka di n'Israel, na agāgupu otù ebo n'Israel ta?
4 O rue, n'echi-ya, na ndi Israel biliri n'isi-ututu, wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo.
5 Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.