6 Umu Israel we cheghari uche bayere Benjamin, bú nwa-nne-ha, si, Ebipuru otù ebo n'Israel ta.
7 Gini ka ayi gēmere ha, bú ndi fọduru, inye ha nwunye, ebe ayi onwe-ayi were Jehova ṅua iyi na ayi agaghi-enye ha nime umu-ayi ndinyom na nwunye?
8 Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.
9 Ndi Israel we gukọta onwe-ha, ma, le, ọ dighi nwoke sitere na ndi bi na Jebesh-gilead nọ n'ebe ahu.
10 Nzukọ Israel we ziga n'ebe ahu orú nnù ndikom na nnù iri sitere na ndi bu dìnkpà, ha we nye ha iwu, si, Jenu, were ọnu mma-agha tib͕ue ndi bi na Jebesh-gillead, ha na ndinyom na umu-ntakiri.
11 Nka bu kwa ihe unu gēme; unu gēwezuga nwoke ọ bula na nwayi ọ bula nke mara ndina nwoke, ka ebibie ya.
12 Ha we chọta n'etiti ndi bi na Jebesh-gilead nnù umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke site na ndina nwoke: ha we me ka ha biarue ọmuma-ulo-ikwū rue Shailo nke di n'ala Kenean.