5 Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova,Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel.
6 N'ubọchi Shamga nwa Anat,N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi,Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.
7 Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi,Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri,Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.
8 Ha rọputara chi ọhu di iche iche;Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile:Àhuru ọta ma-ọbu ubeN'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?
9 Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ,Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel:Gọzienu Jehova.
10 Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu,Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda,Unu na ndi nēje ije n'uzọ,Tugharinu uche.
11 N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri,N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel.Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.