22 Gideon we hu na mọ-ozi nke Jehova ka ọ bu; Gideon we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! n'ihi na ahuwom mọ-ozi nke Jehova iru n'iru.
23 Jehova we si ya, Udo diri gi; atula egwu: i gaghi-anwu.
24 Gideon we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọ ya Jehova-shalom: rue ta ọ digide n'Ọfra nke ndi Abieza.
25 O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Were oke-ehi nke nna-gi nwere, bú oke-ehi nke-abua, nke b͕ara arọ asa, kwadà kwa ebe-ichu-àjà Beal nke nna-gi nwere, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya:
26 wu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ebe-ichu-àjà n'elu ebe a siri ike, n'usoro, were kwa oke-ehi nke-abua ahu, were kwa nkù Ashera nke i gēb͕utu, sure àjà-nsure-ọku.
27 Gideon we chiri ndikom iri sitere na ndi-orù-ya, o me dika Jehova gwara ya okwu: o rue, n'ihi na ọ turu egwu ulo nna-ya na ndikom obodo-ya, ime ya n'ehihie, na o mere ya n'abali.
28 Ndikom obodo ahu we bilie n'isi-ututu, ma, le, akwaturu ebe-ichu-àjà Beal, b͕utu kwa Ashera nke di n'akuku ya, sure kwa oke-ehi nke-abua ahu n'elu ebe-ichu-àjà nke ewuru.