3 O rue, ọ buru na Israel agha nkpuru, na ndi Midian rigoro ya, na ndi Amalek, na umu Iru-anyanwu; ha we rigo imegide ha;
4 ha we ma ulo-ikwū-ha imegide ha, we bibie ihe-omume ala, rue ebe i gābà na Geza, ha arapughi kwa ihe nēdebe ndu n'Israel, ma ọ bu aturu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu.
5 N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya.
6 Ewe me ka Israel ghara inwe ike ma ọli n'ihi Midian; umu Israel we tikue Jehova.
7 O rue, mb͕e umu Israel tikuru Jehova n'ihi Midian,
8 na Jehova ziri otù nwoke, bú onye-amuma, jekuru umu Israel: ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka unu si n'Ijipt rigota, eme-kwa-ram ka unu si n'ulo ndi-orù puta:
9 M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi nile nēmeb͕u unu, M'we chupu ha n'iru unu, nye unu ala-ha: