30 Ndikom obodo ahu we si Joash, Me ka nwa-gi puta, ka ọ nwua: n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà Beal, na n'ihi na o b͕utuwo Ashera nke di n'akuku ya.
31 Joash we si ndi nile nke guzoro megide ya, Unu onwe-unu, ùnu gēkpere Beal ọnu-ya? ma-ọbu unu onwe-unu, ùnu gāzọputa ya? Onye nke gēkpere ya ọnu-ya, ka eme ka ọ nwua: rapu ya rue ututu; ọ buru na chi ka ọ bu, ya kpere onwe-ya ọnu-ya, n'ihi na akwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.
32 Ọ we kpọ ya Jerubeal n'ubọchi ahu, si, Ka Beal kpegide ya, n'ihi na ọ kwatuwo ebe-ichu-àjà-ya.
33 Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel.
34 Mọ nke Jehova we were Gideon kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we fùa opì-ike; Abieza we kpọkọta onwe-ha n'azu ya.
35 O we ziga ndi-ozi nime Manase nile; ha onwe-ha kpọkọta-kwa-ra onwe-ha n'azu ya: o we ziga ndi-ozi nime Asha, na nime Zebulun, na nime Naftali; ha we rigo izute ha.
36 Gideon we si Chineke, Ọ buru na I nēsi n'akam zọputa Israel, dika I kwuworo,