15 O rue, mb͕e Gideon nuru ọzize nrọ ahu na akukọ-isi-ya, na ọ kpọrọ isi ala; o we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū Israel, si, Bilienu; n'ihi na Jehova enyewo ọmuma-ulo-ikwū Midian n'aka unu.
16 O we kewa ọgu ndikom iri-na-ise ahu n'usu atọ, o tiye n'aka-ha nile opì-ike, na ite nke ihe nādighi nime ha, na ọwa n'etiti ite ahu.
17 Ọ si ha, Lenum anya, me-kwa-unu otú a: ma, le, mb͕e mu onwem nābà na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū-ha, ọ gēru kwa na, dika m'nēme, otú a ka unu gēme.
18 Mb͕e m'fùru opì-ike, mu onwem na ndi nile nke sorom, unu gāfù kwa opì-ike, ọbuná unu onwe-unu, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu nile, si, Ayi diri Jehova, di-kwa-ra Gideon.
19 Gideon, na ọgu ndikom ise ndi soro ya, we ba na nsọtu ọmuma-ulo-ikwū na nmalite nche etiti abali, (ọ bu nání mb͕e ahu ka ha guzoro ndi-nche): ha we fùa opì-ike-ha, tupia kwa ite nke di n'aka-ha.
20 Usu atọ ahu we fùa opì-ike-ha, tiwa kwa ite-ha, jide kwa ọwa-ha n'aka-ekpe-ha, na opì-ike-ha n'aka-nri-ha, ifù afù: ha we tie nkpu, si, Mma-agha diri Jehova di-kwa-ra Gideon.
21 Ha we guzo, nwoke ọ bula n'ọnọdu-ya, buruburu ọmuma-ulo-ikwū ahu: ọmuma-ulo-ikwū ahu nile we b͕a ọsọ; ha we tie nkpu, b͕alaga.