26 Ọtùtù nb͕a-aka ọla-edo nile nke ọ riọrọ we di nnù shekel ọla-edo anọ na ọgu ise; nāgughi ihe nile yiri ọnwa, na ihe nile anākwuba na nti, na uwe ododo nile nke di n'aru ndi-eze Midian, nāgughi kwa ihe-inya-n'olu nile nke di n'olu camel-ha.
27 Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.
28 Ewe me ka Midian ruru ala n'iru umu Israel, ha ewelighi kwa isi-ha ọzọ. Ala we di jū ọgu arọ abua n'ub͕ochi Gideon.
29 Jerubeal nwa Joash we je biri n'ulo-ya.
30 Gideon nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom atọ na iri ndi siri n'úkwù onwe-ya puta: n'ihi na ọ nwere ọtutu ndinyom.
31 Iko-ya nwayi nke nọ na Shekem, ya onwe-ya mu-kwa-ra ya nwa-nwoke, ọ gua ya aha Abimelek.
32 Gideon nwa Joash we nwua n'ezi isi-awọ, elìe ya n'ílì Joash, bú nna-ya, n'Ọfra nke ndi Abieza.