1 Abimelek nwa Jerubeal we jerue Shekem, jekuru umu-nne nne-ya, gwa ha okwu, gwa kwa ab͕uru nile nke ulo nna nne-ya, si,
2 Biko, kwuenu na nti ndi nile nwe Shekem, si, Òle nke diri unu nma? na ọgu ndikom atọ na iri, bú umu-ndikom nile nke Jerubeal, nāchi unu, ma-ọbu na otù nwoke nāchi unu? cheta-kwa-unu na ọkpukpu-unu na anu-aru-unu ka m'bu.
3 Ume-nne nne-ya kwue okwu ndia nile bayere ya na nti ndi nile nwe Shekem: obi-ha we wezuga onwe-ha iso Abimelek; n'ihi na ha siri, Nwa-nne-ayi ka ọ bu.
4 Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya.
5 O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.