17 (n'ihi na nnam būru agha bayere unu, tufue ndu-ya n'iru ya, we naputa unu n'aka Midian:
18 ma unu onwe-unu ebiliwo imegide ulo nnam ta, b͕u kwa umu-ya ndikom, bú ọgu ndikom atọ na iri, n'elu otù nkume, me kwa Abimelek, bú nwa orù-ya nwayi, eze ndi-nwe Shekem, n'ihi na nwa-nne-unu ka ọ bu;)
19 ma ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu na n'izu-okè ka unu meworo Jerubeal, me kwa ulo-ya, ta, ṅurianu ọṅu n'Abimelek, ka ọ ṅuria kwa nime unu, ọbuná ya onwe-ya:
20 ma ọ buru na ọ bughi otú a, ka ọku si n'Abimelek puta, ripia ndi-nwe Shekem, na ulo Milo; ka ọku si kwa na ndi-nwe Shekem puta, si kwa n'ulo Milo puta, ripia Abimelek.
21 Jotam we b͕alaga, b͕apu, jerue Bia, biri n'ebe ahu, n'ihi Abimelek, bú nwa-nne-ya.
22 Abimelek we buru onye-isi Israel arọ atọ.
23 Chinek we zite mọ ọjọ n'etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek: