36 Geal we hu ndi ahu, we si Zebul, Le, ndi ufọdu si n'elu ugwu nārida. Zebul we si ya, Ọ bu onyinyo ugwu ka gi onwe-gi nāhu dika ndikom.
37 Geal we kwu ọzọ, si, Le, ndi ufọdu si n'elu-ala nke ala nārida, otù usu si kwa n'uzọ osisi terebinth nke Meonenim nābia.
38 Zebul we si ya, Òle ebe ọnu-gi ub͕u a, na i nāsi, Ònye bu Abimelek, na ayi gēfè ya òfùfè? Nkà abughi ndi nke i juworo? biko, pua ub͕u a, buso ha agha.
39 Geal we pua ga n'iru ndi-nwe Shekem, buso Abimelek agha.
40 Abimelek we chua ya, ọ we b͕alaga n'iru ya, ọtutu madu we da meru aru, rue oghere ọnu-uzọ-ama.
41 Abimelek we nọdu n'Aruma: Zebul we chupu Geal na umu-nne-ya, ka ha we ghara ibiri na Shekem.
42 O rue n'echi-ya, na ndi ahu puru ba n'ọhia; ha we gosi Abimelek.