4 Ha we nye ya ọgu ọla-ọcha atọ na iri sitere n'ulo Beal-berit, nke Abimelek ji go ndikom efu ndi obi-ha nādighi adi n'otù ebe, ha we jeso ya.
5 O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.
6 Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n'akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem.
7 Ha we gosi ya Jotam, o we je guzo n'elu ugwu Geraizim, welie olu-ya, kpọ, si ha, Genum nti, unu ndi-nwe Shekem, ka Chineke we ge unu nti.
8 Osisi jere eje ite otù onye manu ka ọ buru eze-ha; ha we si osisi olive, Buru eze-ayi.
9 Osisi olive we si ha, M'gāgha manu nkem, bú nke ha ji sọpuru Chineke na madu nimem, je ifeghari n'elu osisi nile?
10 Osisi nile we si osisi fig, Gi onwe-gi bia, buru eze-ayi.