42 O rue n'echi-ya, na ndi ahu puru ba n'ọhia; ha we gosi Abimelek.
43 O we chiri ndi-ya, kè ha usu atọ, rue nbì n'ọhia; ọ hu, ma, le, ndi ahu si n'obodo ahu nāputa; o we bilie imegide ha, tib͕ue ha.
44 Abimelek na usu ndi soro ya we made, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo: usu abua ahu we made imegide ndi nile nọ n'ọhia, tib͕ue ha.
45 Abimelek we buso obodo ahu agha ubọchi ahu nile; o we were obodo ahu, b͕ue ndi nọ nime ya: ọ kwatue obodo ahu, ghasa ya nnú.
46 Ndi nile nwe ulo-elu Shekem we nu ya, ba n'ulo kachasi elu nke ulo El-berit.
47 Ewe gosi Abimelek na ndi nile nwe ulo-elu Shekem achikọtawo onwe-ha.
48 Abimelek we rigo n'ugwu Zalmon, ya onwe-ya na ndi nile soro ya; Abimelek we chiri anyu-ike-ha n'aka-ya, o we b͕utue alaka osisi, welie ya, tukwasi ya n'ubu-ya: ọ si ndi soro ya, Ihe unu huworom ka m'mere, menu ngwa, menu dika m'meworo.