50 Abimelek we jerue Tibez, ma ulo-ikwū-ya megide Tibez, were ya.
51 Ma otù ulo-elu siri ike di n'etiti obodo ahu, ndikom nile na ndinyom nile na ndi nile nwe obodo ahu we b͕alaga n'ebe ahu, mechibido onwe-ha uzọ, rigo n'elu ulo-elu ahu.
52 Abimelek we biarue ulo-elu ahu, buso ya agha, jerue nso ọnu-uzọ ulo-elu ahu iwere ọku sure ya.
53 Otù nwayi we tua aka-nkume n'isi Abimelek, tuwa eju-isi-ya.
54 O we me ngwa kpọ nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, si ya, Miputa mma-agha-gi, me ka m'nwua, ka ha we ghara ikwu okwu bayerem, si, Nwayi b͕uru ya. Nwa-okorọbia-ya we mapue ya, ọ nwua.
55 Ndikom Israel we hu na Abimelek anwuruwo, ha we la, nwoke ọ bula n'ebe nke ya.
56 Chineke we nyeghachi ihe ọjọ Abimelek, nke o mere nna-ya, n'ib͕u ọgu umu-nne-ya atọ na iri: