1 Ahuhu diri obodo nke nēnupu isi, nke ruwo-kwa-ra árú, obodo ahu nke nēme ihe-ike!
2 Ọ geghi nti olu Chineke; ọ naraghi idọ-aka-na-nti; Jehova ka ọ nātukwasighi obi; Chineke-ya ka ọ nābiakuteghi nso.
3 Ndi-isi-ya n'etiti ya bu ọdum nāb͕ọ uja; ndi-ikpe-ya bu anu-ọhia wolf nke anyasi; ha ekpechaghi ọkpukpu n'ututu.
4 Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n'otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike.